Tropical night

A tropical night bụ okwu a na-eji n'ọtụtụ mba Europe akọwa ụbọchị mgbè okpomọkụ anaghị ada n'okpuru Celsius iri abụo (68.0 ) n'ogè abalị.[1] A na-eji nkọwa a eme ihe na mba ndị gụnyere United Kingdom, Republic of Ireland, Spain, Sweden, Norway, Netherlands, Germany, Finland, Lithuania, Latvia, Hungary, Serbia na Croatia. Na United States n'ụzọ dị íchè, a na-eji ókwú ahụ bụ "abalị na-ekpo ọkụ" eme ihe mgbè okpomọkụ anaghị ada n'okpuru Celsius iri abụọ (80.6 ) na steeti Gulf na Atlantic.

A na-ahụkarị abalị ndị na-ekpo ọkụ n'ogè oke okpomọkụ ma na-emekarị n'oké osimiri, ụsọ mmiri nà ọdọ mmiri. A na-echekwa okpomọkụ na mmiri n'ogè anwụ na-acha ma na-ekpo ọkụ n'ehihie, nke a na-ewepụta n'abalị ma mee kà okpomọkụ abalị dị elu.[2]

  1. McGrath (2 November 2018). Weather: UK experiencing hotter days and 'tropical nights' - Met Office. BBC. Retrieved on 9 April 2019.
  2. Tropiska nätter (SV). SMHI (18 June 2021). Retrieved on 31 July 2021.

© MMXXIII Rich X Search. We shall prevail. All rights reserved. Rich X Search